11
I nyocha Oru Atumatu Equator Uzo toro-ato maka mmepe ime obodo, ndi mmadu, okike, na obodo na-agbasi mbo ike Nigeria NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Empowered lives. Resilient nations.

NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

  • Upload
    others

  • View
    4

  • Download
    0

Embed Size (px)

Citation preview

Page 1: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

I nyocha Oru Atumatu EquatorUzo toro-ato maka mmepe ime obodo, ndi mmadu, okike, na obodo na-agbasi mbo ike

Nigeria

NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS)

Empowered lives. Resilient nations. Empowered lives. Resilient nations.

Page 2: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

USORO ORU ATUMATU EQUATOR NKE UNDPNdi mba nile, ndi bi n’ala nnanna ha na mbauwa nile gbaa gburugburu na-agawanye n’ihu i choputa uzo mmepe ohuu ga ato-ato, ka mma, maka mmadu na maka okikesina chi. Ha adighi ukwuu bu akwukwo e dere, ma o bu akuko a kogoru, nke na-egosi n’uju etu atumatu ohuu ndi a achoputara siri malite, ka ufulu ha si mie ala, na makwa ka ha si ahazighari onwe ha ka chi na-efota. Naani mkpuru mmadu ole na ole ndi dere akwukwo ndia nwetara akuko ha site na mgbaziri nke ndi na-aru yabu oru n’ime obodo.

I ji were mee mmemme ogbugba afo iri e guzubere ya, Atumatu Equator na-agba mbo iko akuko ndi a, site n’onu ndi ruru oru. Akuko usoro-ihe-e mere nke a koro ebe a bu ofu n’ime otutu, nke na-egosiputa olu ndi tuuru ugo n’olu Atumatu Equator-nke o bu ndi otu oru ibe ha nyochara, hoputa dika ndi kacha daba n’anya n’ihe banyere i chekwaba gburugburu onye, i cho uzo ka mma, toroato ilekota ebimundu, nke oha obodo ga-emeli n’onwe ha. Akuko ndi a na-enegaraanya i nye aka kwalite itukorita uche n’usoro ochichi, nke ga-akwalite usoro ndi a n’ime obodo. O ga-enyekwa aka i me ka mmuta na omuma banyere gburugburu ebe anyi bi, na uzo mmepe obodo buru ihe onye obuna ga-ama maka ya. O ga-enyekwa aka ka usoro ndi a buru ihe nñomi nye mmepe ime obodo ndi ozo. ‘Ike oru a ruru n’ime obodo: Nturu ugo n’ihe mmuta sitere n’olu afo iri nke Equator’ bu uzo kacha mma i ji ghota akuko usoro oru ndi a, nke bu nchikota ihe mmuta na ihe ntuzi aka sitere na oru a ruru.

Tudo n’ihe osise ka-obodo-siri-noro ka i were hu ihe edegara banyere Oru Atumatu Equator.

Ndi OdeeOnye isi ndi odee: Joseph CorcoranOnye nchikota ndi ode: Oliver HughesNdi soro dee: Dearbhla Keegan, Matthew Konsa, Erin Lewis, Whitney Wilding

Ndi nyere aka deeEdayatu Abieodun Lamptey, Erin Atwell, Toni Blackman, Jonathan Clay, Joseph Corcoran, Larissa Currado, Sarah Gordon, Oliver Hughes, Wen-Juan Jiang, Sonal Kanabar, Dearbhla Keegan, Matthew Konsa, Rachael Lader, Patrick Lee, Erin Lewis, Jona Liebl, Mengning Ma, Mary McGraw, Gabriele Orlandi, Juliana Quaresma, Peter Schecter, Martin Sommerschuh, Whitney Wilding, Luna Wu

Ndi Choro Nma Oliver Hughes, Dearbhla Keegan, Matthew Konsa, AMy Korngiebel, Kimberly Koserowski, Erin Lewis, John Mulqueen, Lorena de la Parra, Bran-don Payne, Mariajosé Satizábal G.

Ndi anyi na-ekeleThe Equator Initiative acknowledges with gratitude The Smallholders Foundation, and in particular the guidance and inputs of Nnaemeka Ikegwuonu. All photo credits courtesy of The Smallholders Foundation. Maps courtesy of CIA World Factbook and Wikipedia. Chika Mbah tughariri oru atumatu a n’olu Igbo; ebe Lydia Onyeka Odeh lebaara ya anya. [Ndi nnyeaka Otu jikoro Mbauwa (United Nations)].

Ebe e nwere ike ihu oru aUnited Nations Development Programme. 2012. The Smallholders Foundation, Nigeria. Equator Initiative Case Study Series. New York, NY.

Page 3: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

N’IBE OKWU GBASARA ORU A ICHAFUNguzobe Ndi-Oji-Obere na-akwado usoro olu ugbo toro-ato , nchekwaba okike di na gburugburu anyi site n’iji igwe okwu ‘redio’ zisaa ihe mmuta. Kwa ubochi, mgbasa ozi Redio maka ndi oru ugbo smallholders no N’ime Obodo na-akuzi ihe banyere nhazi olu ugbo, nchekwaba ihe okike gbara anyi gburugburu, i wa otutu uzo e si abanye ahia nke ga-abara ndi olu ugbo. Ndi smallholders mutara ihe ndi a kariri nari puku abuo na okala n’onu ogugu. Asusu e jiri gbasaa ozi a bu asusu Igbo. Ya bu ozi na-ejezu n’igwe okwu di na okpuru ochichi goomenti ato nke Imo steeti, nke Nigeria. Ihe mmuta ndi a na-enyere ndi olu ugbo aka I ji usoro ka mma na-aru oru ugbo. O na-enyekwa aka i wa uzo ahia di iche iche, nke wetara na oru ugbo na-enye ha ego kitaa karia ka o di na mbu. Nguzobe a na–enyekwa ihe omumu maka uzo i ko ugbo na-etinye echiche banyere gburugburu anyi, i di ocha n’ime ulo, i dobe gburugburu anyi ocha, nakwa etu udi nri di iche iche si e nyere anyi aka.

OKPURUKPU IHE GANTURU UGO NKE EQUATOR: 2010

AFO E GUZOBERE YA: 2003

EBE HA NO: Imo State, nke Nigeria

NDI RITERE URU YA: 250,000 ndi na-ako oruugbo n’obere

UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike

3

NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria

IHE DIGA N’IME YA

Ntoala ya, na ihe di n’ime ya 4

Okpurukpu Oru na nchoputa ohuru 5

Ufuru ya n’udidi okike di iche iche 7

Ufuru ya n’ihe gbasara mmekorita-na-akunuba 8

Ufuru ya n’atumatu ochichi obodo 8

Ito-ato 9

Mmenwo 9

Itikoaka n’oru 9

Page 4: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

4

Okike di ndu, nke chi nyere ala anyi bu Nigeria kariri n’ime obodo, bu ebe ndi bi na ya ji okike ndi ahu elekota ndu anya, akpa-nri, egbo-mkpa, elekota ahu ike na idi nma ha anya. Ihe kariri uzo asaa, n’ime uzo iri ndi Nigeria bi n’ime obodo, ma na-aru kwa oru na ya. Onu ogugu ndi Nigeria kariri nde nari na iri ise mmadu (150 million). Otutu ndi bi n’ime obodo a ji oru ugbo biri. Ihe na-enyega aka n’uzo mgbasa ozi akwudochabeghi n’ala anyi. N’ihi ya, ha adighi ukwuu , bu ndi oru ugbo na-enwetanwu ozi ohuru di mkpa maka ichekwaba ihe di n’okike ngwangwa. Oku latric anaghikwa adi mgbe dum. Otutu obodo enwetabeghi oku latric ma oli. Uzo ozi ogbara ohuru, bu internet ka ghooro ndi no n’otutu ime obodo na ndi olu ugbo ihe akuko. Ozo dika ibe ya, ndi oru goometi na-ezisa ozi maka oru ugbo na maka ichekwaba oke ohia, ndi a na-akpo ‘extension workers’, bu ndi oru ha bu ihu na nkuzi o gbara ohuru di ndi oruugbo mkpa rutere ha aka aburula akuko akoro-ako.

Ihe niile ndi a mere ihe e jiri nwee oke ogbatauhie n’etiti mbo ime ka mmuta ohuru, mmuta si n’oru a ruru aru, na mgbazi banyere oru ugbo toro-ato, na nchekwaba ihe di n’okike n’otu aka, na ndi oru ugbo n’aka nke ozo. Ozi oma ndi a anaghi erute ndi n’ako obere oru ugbo aka. N’ihi ya, ha amaghi etu ha ga-esi na-enwe ihe ahia na-acho mgbe dum. Ogbachi niile ndi a na-eweta mmebi gburugburu anyi, ibawanye n’ uko, na egwu banyere uko nri. Nkewapu nke ndi obere oruugbo n’ebe ozi banyere oru ugbo di na-adochigha oru ha azu, nke putara i dochigha mkpata ego ha azu.

Igbochibido ogbatuhie di na mgbasa ozi

O bu n’afo 2003 ka ehibere Nguzobe Smallholder. O bu nguzobe nke aka goometi adighi na ya, nke na-enyere ihe dika Nde Nari Ato na Iri Ise (3.5 million) ndi obere oruugbo aka. Otutu ndi oruugbo ndi a bu ndi ugbo ha akarighi otu ama egwururegwu futbol. Nguzobe Smallholders na-eji igwe okwu redio agbasa ozi na-akwalite oruugbo, imerime uzo esi acho ihe eji ebi ndu, na etu e si echekwaba gburugburu. Mgbasa ozi redio nke Ndi oruugbo Smallholders bi n’ime obodo na-akuzi ihe banyere nhazi oruugbo, nchekwaba

gburugburu, iwa uzo ahia, na-abu elekere awa iri kwa ubochi. Ozi ndi a na-erute Nari Puku Abua na Iri ise (250,000) ndi na-ako oruugbo n’obere. E ji kwa asusu Igbo e zi ozi a. Ozi igwe okwu redio a na-eme ka ndi oru ugbo oke anaghi erute nwee ike i muta uzo ohuru di iche iche di n’oruugbo, uzo nchekwaba gburugburu, matakwa ka ahia si kwuru nke taata, nyekwara ha ike igbaasa ozi maka ihe nke ha koputara. Mgbasa ozi a na-emetuta aka n’ikoputa nri, i zu anu, nchekwaba udidi di iche iche n’okike, inyere ala akuku aka, igbochi mbuze, ihazi ugbo, nri izu oke, di kwa ahu nma, iri-nri etu o kwesiri, oria mminwu HIV/AIDS, iba, agbugbo oyibo (fertilizer), na otapiapia e ji a ko ugbo, i chekwata mmiri ozizo, mgba mmiri agaraghi onu, i nweta mkpuru akuku ka nma, ibawanye ahia, I nwetanwu ego mgbazinye, ohere ajuju na aziza. Ihe ndi ozo di n’oge ozi a bu i kwanite ikikere na ako azumahia ndi oruugbo, nnyoputa ihe ahia nyere, itule uru na oghom, idokwa ego na ihe gbasara ulo aku, mgbako na mwepu di n’oruugbo, i guzu ihe onye nwere, na nhazi oru aka ha n’udi ga egosiputa, site n’ihe edere ede, usoro ha choro i si were kwuru n’odinihu.

Uzo e si wudo ya, na ka e si abanye n’otu a

Uzo ndi n’abuo na-achikoba Nguzobe Smallholders: Ndi e were na ntukwasi obi( Board of Trustees) na ndi otu n’onwe ha. Ndi otu Ntukwasiobi na-adi mmadu isii. O bu ndi otu na-ahoputa ha. Oru ha bu i hu na ebumnuche otu a na-aganye n’anya e jiri guzobe ya. Ha na-ahukwa maka iche ya ihu n’uzo ka mma. Ndi nchiko a nwere onye Isioche, ya bu onye isi nlekota, bukwa onye ndi otu hoputara. Ndi otu n’onwe ha bu ndi oruugbo bi n’ogbe ahu, ya na otu ndi ozo aka-goomenti- adighi -na ya. O bu oru diiri ndi otu ihoputa ndi nlekota atukwasiri obi. A na-ahoputa onye isinlekota kwa afo abua obula. Onye choro ibu onye otu ga-ezite akwukwo i ji yoo maka ya. Ndi otu nlekota ga-elebara ya bu akwukwo anya. O bu site na i gu ugboro ole, na-oge o were izisa ozi ka esi amara e tu e si mebe okpurukpu ihe nke otu a: site na akwukwo ozi e detara, ozi odide igwe okwe foonu (text messages), okpukpo a kporo ndi redio na phone, na akwukwo i gba oha ajuju e dere nke oma.

Ntoala ya, na ebe o hibere isi

Page 5: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

55

Okpurukpu oru na nchoputa ohuru

Mbu na mbu ebumnuche Nguzobe Smallholders bu inye ndi oruugbo bi na odida anyanwu Nigeria ikikere site n’inye ha ozi di mkpa banyere imeri oke i da ogbenye, na i chekwaba gburugburu. N’otu oge ahu, otu a na-agba mbo i hu na onu ruru ndi oruugbo n’okwu, biakwa mee ka ha gbakoo onu n’itule ma gbokwaa nsogbu di na udidi di iche iche n’okike, nakwa isonye n’udi uzo ogbara ohuru e ji ako ugbo, na uzo ihazite gburugburu anyi. Ka e wee mejuputa ihe ndi a, Nguzobe Smallholders guzobere okpurukpu uzo olu ano.

Ulo mgbasa ozi redio ndi oruugbo guzobere, maka ndi oruugbo

Oru izizi otu a bu Oru Ozi igwe okwu maka ndi oruugbo Smallholders bi n’ime obodo, nke e guzobere n’afo 2007 sitere na nkwado Otu Mbauwa n’ahu Maka Agumakwukwo, Nchoputa Sayensi na Odinala. (United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (UNESCO). Oru nzube a na-ahu maka ikwado usoro oru igbasa ozi banyere nhazi oruugbo, ichekwaba gburugburu , na maka azumahia n’ime obodo. Isi okwu ya bu iji uzo kacha nma were mee ka oruugbo were mebe ofuma, nke ga-abawanye uru di n’oruugbo, wee nye ndi oruugbo ego karia na mbu, nyerekwa aka chekwaba gburugburu anyi.

Oru redio a na-eme ka ndi oruugbo mata uzo o gbara ohuru di n’iko ihe, ichekwaba gburugburu, i mata ihe ahia nyere, na ime ka oha mara ihe ha koputara. Uzo ozi a na-ekwuwaputakwa gbasara otutu ihe dika izu anu, ilekota ala akuku, ihazite ugbo, nri idi mgbe niile, igbochi oria na-efe efe, ahu ike oha obodo, ihazite ezigbo mmiri onunu, inwetanwu ego mgbazite, na ako azumahia. Na ime ka uzo ozi a mitawanyekwue mkpuru, ndi ulo oru ‘redio’ ime obodo a na-aga n’ime obodo e zisa ozi a, ebe ha na-aga n’ime ubi egosi site na ime ya eme, udi usoro ohuru ndi a, nke ihazite oruugbo toro-ato.

Ozokwa, udi uzo ozi okwu-nkwugharita maka ‘otu ndi na-egenti’ na-enye ndi oruugbo ohere ikowa uru ozi ndi a na-abara ha. A na-esi n’ugbo ziga ihe niile bu ihe ndi oruugbo kwuru n’ulo oru redio, site

na waya ‘antena’ di n’ulo oru redio. Ihe niile ndiuq1a anaghi anapu ndi kwuru okwu ego obuna, ma o na-emekwa ka ha nwee ike iju ajuju gbasara oru ha.

Ozi setipukwuru aka site n’ulo oru redio

Okpurukpu oru ozo bu Oru Mgbasa Ozi edere ede site n’igwe okwu redio. Atumatu a na-eji ukwe [uri] a guru iche maka oru a, akwukwo edere ede maka iguputa na redio, ihe egwuregwu (drama) wee na-akuziri ndi ime obodo ihe omumu maka usoro oruugbo ohuru. Ihe nke a kacha a rutu aka bu maka isuchasi ahihia na imunye ya oku, iguzobe obere ugbo, nchekwaba onwe n’oruugbo, uzo ikpotulata ihe owuwe oruugbo, i nye umu nwaanyi ikikere, ndi ntorobia i banye n’oruugbo, ihe gbasara ahu ike oha obodo, ka e si e nwe ani, ka e si a gbazinye ani, ego mgbazite, i lekola ala akuku, mmiri na idi ocha, nhazite ala ulo, ya na i chekwaba gburugburu. Ukwe, ozi odide, na egwuriegwu ndia siri n’echemeche ndi oha obodo wee puta, mana esizi n’ulo oru redio wee gbasaa ya, ka o rue n’ime ime obodo.

Inye ndi ntorobia ikikere n’ihazi oruugbo

Okpurukpu oru nke ato bu Oru Ubi Uloakwukwo, nke na-a chokari uloakwukwo di n’obodo ndi ahu, ka o were nye ndi ntorobia mmuta na oru aka di n’oruugbo. A na-eguzobe ubi ebe ndi ntorobia na-amu ka e si aghota, ma rekwaa akuru ubi, ka e si ahazi ego eji aru oru, na ka esi azu umu anumanu. Oru a na–egosiputa n’uju udi uzo niile e si ahazi ugbo, nke egosiputara n’ugbo, na abughi nke amutara n’ime ulo akwukwo. O bukwa umu akwukwo na-ako ubi ndi ahu, ma na-elekotakwa ha anya, n’oge a bughi oge agumakwukwo, ebe mmasi umu akwukwo di, nke na-enye ako-na-uche amutara amuta, banyere uzo ichu ego di iche iche di oruugbo.

Igosi uzo oru ohuru site n’inye kuzi n’ihu oru

Okpurukpu oru nke ano nke otu a bu oru igosiputa na ikuziri ndi oruugbo n’ime obodo, nke ga-eme ka ha nweta ihe owuwe ihe

Page 6: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

66

ubi karia, ma mekwaa ka uzo oruugbo ka nma buru ihe mmadu dum maara. Oru nke a gbadolu ukwu n’ikuziri ndi oruugbo etu e si elekota ihe akuru aku, na anu a na-azu azu, igbu ugbo n’uzo di ocha, ihazita ugbo mgbammiri n’uzo agaraghi onu, idota ike eji aru oru nke ga-adigide, ya na ichekwaba gburugburu. A na–akuzi aka oru ndia site na ihe omume. Uzo oru a bakariri uru n’ikuziri ndi oruugbo n’ime obodo ihe gbasara ihe diga iche n’okike n’ebe di iche iche, ya na ijikwata ihe di n’okike onu ka ha rukoo oru onu n’ebe niile mmiri n’ezo nke oma, n’ala ulo, na mana ala odo-mmiri.

Ihe nkuzi ndi ozo bu uzo ndi ozo kariri ikpo ahihia ala ubi oku, igbochi mbuze na ide, ihazite ala di n’akuku iyi, idobe iwu na-echekwaba mmiri oha obodo na-echu, na mmiri iyi di n’obodo site n’iku osisi na-egbochi anwu, ikoghachi osisi egbuturu egbutu n’oke ohia, ikuchi osisi n’obodo, uzo e si aku azu, osisi na-aba otutu uru, igbu-ugbo oke ohia, ihazite nnunu mmiri ga, ihazita odidi anu ohia, na iji ihe di n’okike mere ihe nkiri.

Uzo ohuru esi etinye nka n’uzu amabu ama ka o baa uru karia Nguzobe Smallholders na-eji nka di bu adi n’ime obodo iji mee, obughi naani ka ndi oruugbo nwatanwanyekwue mmuta n’uzo ogbara ohuru n’oruugbo na n’oru ichekwaba gburugburu, kama ka ha ghara ibu naani ndi na-ege nti na nkuzi, ka ha soro tinye onu n’okwu ma abia n’ihe gbasaara uzo oruugbo kacha nma. Usoro a di ihu abua, n’uzo ikparita uka. Erere ya gbadolu ukwu na nkwado oha obodo na-enye ya, site na atumatu ya rue na mmeputa ya. O na-egosi ebumnuche ndi oha obodo, na abughi mkparita uka efu. O bukwa uzo i kwado ntugharita uche, nke na-eme ka mmadu niile jikoo onu, kuziere ibe ha ihe, bawanyekwue ihe omuma di na obodo. Igwe okwu redio bu otu uzo igbasa ozi n’ime obodo di oke ire. Na agbanyeghi otutu uzo ohuru esi agbasa ozi, redio ka buriri nke kacha erute onye obula aka, onu ego ya di ala. Otutu mgbe, ya bu uzo ozi si erute otutu ndi mmadu n’ime obodo ngwangwa. Nguzube Smallholders weere uzo mgbasa ozi e jibu ere ahia,na i kwu ihe masisri onye were mere ihe oru e ji enye ndi ime obodo ikikere.

“Mgbanwe di n’ihu igwe buuru anyi ihe mkpagbu gbara ohuru. Ka osinadi, ohere diiri anyi iji igwe okwu redio zie ozi, kuziere, ma mezikwaa uzo ibelata nsogbu mgbanwe a ga-ewetara ndi na

ako obere ugbo, ma kuzikwaara ha ka ha ga-esi na-eso ihe mgbanwe ndi a.” Okwu si n’onu Nnaemeka Ikegwuonu, Onye isi oru, Nguzobe Ndi-oji-obere

Page 7: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

7

Ufuru oru ndi a

UFURU YA N’UDIDI OKIKE DI ICHE ICHENguzobe Smallholder nwere nno ezi ihe mgbanwe di iche n’ebe ihe gbasara gburugburu na udidi okike di iche iche di, okachasi n’ihe banyere uzo ka nma n’oruugbo n’echebanyere ihe di n’okike uche, okpukpa agwa ka nma, echiche banyere ihe mgbagwojuanya di na gburugburu, na ka e si emezi ha, ya na ibu akurungwa di ike n’ichikonata oha obodo ka ha jiri otu obi ruo oru.

Ichikonata oha obodo ka ha dekwaa ihe di n’okike

Oha obodo di iche iche na-eguzobe ma na-amakwa iwu ka e debe iwu ha nwere banyere nhazi ala odommiri na oke ohia/ala ubi. Iji were maa atu, oru Nguzobe Smallholders emeela ka e tie iwu abua jigidere oha obodo banyere ichekwaba anu enwe a na-akpo Sclater’s Guenon (Cercopithecus Sclateri), nke ejikwa ‘enwe uwa akwukwo ndu’ mara. Mbo nke oha obodo a bu uru sitere n’ihe egwuregwu onwa ato emere n’igwe okwu redio banyere i chekwaba enwe. Otu a na-akpalitekwa ‘ikpauka nke otu ndi na-ege nti’ banyere ihe gbasara i chekwaba anu ohia, ka e were si etu a gbasaa ozi banyere agwa oma kwesiri maka ichekwaba okike. Otu ige nti a na-ezuko kwa izu-uka, ma obu kwa onwa, gee nti na ihe di aghaa a ne-eme n’igwe redio, tulee ya, ma zighachiri ndi ulo oru redio ozi banyere ya.

Ozo, site na ihe omume na ihe nkuzi igwe redio, ndi oruugbo na-aru ebe ka nma ichekwaba ihe akuku nke ga ebelata imefu okike sinachi. A na-akowa na ihe ala ubi ha na-emeputa ugbua, kariri nnoo ka ala ahu sibu emeputa ihe na mbu. A na-akowakwa na oru ndi a rugolu, na mbo i kuzi usoro ohuru e meele ka e chekwaba ala oke oha kariri ogu puku hectare na ito. Uloakwukwo ise e guzobela ‘Ndi otu akwukwo ndu’. Nke a bu mkpuru oru Ubi Uloakwukwo mitara. Umu akwukwo so n’otu a bu nnoo obuuzo oru n’ihe gbasara oru ikuchigha osisi e gbuturu egbutu, ya na iku iriro ‘vertiva’ n’ala kpodara akpoda, ya na n’ala ugwu. Nke a ga-enye aka igbochi mbuze.

A na-elele uru odididicheiche n’okike bara kwa izu-uka, na kwa onwa. Okpurukpu ihe di na gburugburu na-egosiputa ya buga: mmadu ole n’ime ndi na-ako obere oruugbo malitere sonyebe n’uzo a kacha nma, osisi ndi oha obodo kuru, ka esi edebe iwu oha obodo tiri banyere udididicheiche n’okike, isi sekpunti n’okwu mgbasa ozi a na-enye kwa ubochi banyere oruugbo na maka gburugburu, mkpuru akuku e si n’ugbo ha ka otu ama futbol weputa.

Inoghari dika ihu igwe siri tughari

Otu oru ima-atu nke Nguzobe Smallholders na-aru n’ikuzi ihe banyere gburugburu bu ihe- egwuregwu emee-emepukwa di Iri Abua ha guzobere na redio. Emebere ihe egwuregwu ndi ahu iji were nye aka kuziere ndi otu smallholders maka ka esi eso ihe mgbanwe a na–ahu n’ihu igwe. Ihe egwuregwu obula nwere ihe di iche o na-arujere aka na i ma ka aga-esi belata ihe oghom nwere ike isite n’ihe mgbanwe ndi ahu puta, ya na etu o si gbasara ebimndu toro-ato n’obodo anyi bu Nigeria. Omumatu isi okwu ihe egwuregwu ndi ahu e degara, ma mekwaa bu: etu e si aku osisi n’aba otutu uru, ka e si egbochi oti na

Page 8: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

oria akuku ubi n’oge igwe na-agbanwe, uzo ihazite mmiri na ala mgbe igwe na-agbanwe, uzo e si edochigha oke ohia e mebierela emebi, uzo ogbara ohuru e ji aku azu na mgbanwe ihu igwe, umu ihe ka abauru n’iku azu, i belata aka n’ikpokolota anu ozuzu onu, igwakorita anu ka atakari akwukwo ndu, na anu na-atakari iriro nkiti, ihazite ala ikpere mmiri, ima ka a ga-esi nokwata n’oke mgbanwe ntumadi nke ihu igwe na idota ike agwu-agwu e ji aru oru di n’okike, iko akpu n’amaghi mgbe mmiri ga-ezo, ikonwanye otutu ihe akuku, ihe akuku na-anagide oke ekponoku na nnu, i gbaziri oha obodo ka ha kee nkwucha ihe ndi a, dikwa njikere, ikuziri ha ka e si ejekwuru ndi ochichi, riotakwa enyemaka ha.

UFURU YA N’IHE GBASARA MMEKORITA-NA-AKUNUBA Ihe kariri Nari Puku mmadu Abua na Iri ise (250,000) ndi biga n’ime obodo diga n’Imo Steeti na-enweta erere oru na nzube nke Nguzobe Smallholders. N’oru nchoputa ufuru ya, otu a choputara na kwa ogu mmadu ato na ise, n’ime nari mmadu na-ege nti n’ozi ha na-agba osiari ka ozi ndi a siri baara ha uru na adimundu ha kawanyere nma, welitekwa ikpata ego nke ezinulo ha. Ndi oruugbo na-akowa na oka, akpu, ji, na akwukwonri ha na-akota ugbua na ihe dika otu ama futbol jiri okara mmeputa banwanye karia ihe ha na-enwetabu na mbu. Ha na-akowa na o bu usoro uzo iko ihe ohuru ndi a kpatara ya bu mbawanye. Mkpataego ezinulo na mbu nobu na otu isi ego America kwa ubochi ($1/day) nozi na otu na okara isi ego America kwa ubochi ($1.5/day).

Uru ndi ozoga na-eso oru ndi a di otutu. Imerime ezinulo ezigabala umu ha akwukwo, maka na ndi muru ha akpatabala ego iziga ha n’ulo akwukwo. Idebe onwe onye ocha, idebe gburugburu ocha, na iri nri dika ahu onye siri cho, sokwa n’uru ndi ahu. Mkpuru akuku imitawanye karia, site na ima ka e si aku akuku di icheiche ihe, oriri adikwala na mpaghara niile ahu ofuma.

Site na mgbasa ozi redio, ndi oruugbo enweele ohere imata ihe ahia nyere kwa ubochi, nke na-enyere ha aka imata ebe na mgbe ha ga-ere ahia ha. Nguzobe Smallholders adonyekwuola mbo ibupu ihe n’ahia ukwu, nke na-ejikota ndi na-akoputa ihe na ndi na-azu ya.

Oru ozi redio ndi ahu aburula uzo inyere oha obodo aka, nke nyegoolu ha aka ijiko obi, kpokolota onwe ha onu, okachasi n’ihe banyere nchekwaba ihe di n’okike na uzo ebimndu. Enweela ogbako di iche iche guzobere onwe ha maka itule ozi redio ha nugara nke metutakariri mkpa ha aka, dika idozighari ulo-akwukwo, itinyere oha obodo mmiri oñuñu, na ndi ozo ga. Nke ka nke, ego a na-esi n’oru redio ahu enweta na-abanye n’ikwudo ubi ogbara ohuru n’uloakwokwo diga n’ime obodo ndi ahu. Nke a na-enye aka ikuziri umu akwukwo uzo ohuru esi ako ugbo, nke bukwaara ha uzo inweta ezigbo oru ma ha guchaa akwukwo.

UFURU YA N’ATUMATU OCHICHI OBODONguzobe Smallholders ekewaputala ndi oruugbo ohere n’okwu banyere ochichi - ebe ha na-ekwunwu hohaa ka osi metutaha, na ihe na-akpagbu ha n’ihe bagidere mmepe obodo na ichekwaba ihe di n’okike. Mmadu asato ndi Smallholders, e siri n’ime obodo ga hota, ma zukwaa di nnoo ka ndi uko na mkparita uka okwu akpu n’onu banyere uzo ochichi obodo. Ndi mgbasa ozi bu ndi asusu Igbo na asusu bekee doro anya ofuma. Na mgbakwunye, e siri n’ime obodo ndi na-ege ozi redio ndi a nti wee hota mmadu iri sonyere na ndi na–ahazite oru ozi redio ndi ahu. Ha na-ahukwa maka imeputa ya, idozighari ya etu okwesiri, inabata ozi okwa a kwuru ugwo ya, ihu na ihe niile na-aga nke oma n’ibara ndi e jiri maka ha wube ya uru.

Na mbu, akwadobughi ya ka o buru ohere itunyenwu onu n’okwu usoro ochichi, maobu nke ituta ero maka usoro ochichi. Na agbanyeghi ya, olu a enyela ndi oha obodo onu okwu n’ihe gbasara ha, ya na n’ihe na-akpado ha. Mgbasa ozi redio ahu bukwa ohere ndi obodo ji egbo mkpa diiri ha, kparitakwa uka ogbo na ogbo, ma burukwa uzo e si agbaziri ochichi ime obodo n’ihe gbasaara ihe na-emebe-ofuma-ugbua, ihe na-enye nsogbu nye nchekwaba ududiokike di icheiche, na uzo toro-ato e ji ha eme ihe, oruugbo, umu oru na-enye ego eji achu ida ogbenye oso. Otu Nguzobe smallhoders akwudogo uzo ikparitauka n’etiti onye na onye maka ndi ogbenye bi n’ime obodo - otutu n’ime ha bu ndi agbajighi chalk, ka e wee nu olu ha, ka ha marakwa ihe na-eme, wee buru ndi nwere ike iji mmuta ohuru a na-enye ha nye aka igbanwe onodu ha, ka owee kawanye nma.

Atumatu a aburula nnoo oke uzo inye ndi oha obodo ikikere, kaa ndi oruugbo bi n’ime obodo obi banyere uru di na mmuta ha, na ume ha nwere iji gboo mkpa, were buru ndi ndu n’iwepata ezigbo ihemgbanwe n’obodo ha. A na-ahutakwa ihe ikekere a ka udiri ogbako di iche iche si akwudo onwe ha n’ime obodo. Ogbako ndi a na-eleba anya n’ihe gbasara gburugburu na mmepe obodo- tinyere nke metutara oru maka idokwa oke ohia ga, nke mere ka e chekwaba ala kariri ogu hectare abuo na ato agaara igbutu- ozokwa bu mbo oha obodo na–agba iji hazite ala ikpere mmiri, ala odommiri, alaapiti na anuohia ga.

8

Page 9: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

9

Ito-ato na mmenwo

ITO-ATO Atumatu a aburula nnoo nke toro-ato na nhazite obodo, makana o ruturu ndu obodo ndi ahu aka n’uzo di ichiche, ha were were ya ka ihe ha. Ndi na-aru oruugbo n’ime obodo ahugo uzo irite uru di iche iche site n’ozi redio, ya na oru ndi ozo kara puta ihe nke otu a, ndi nke nyere Nguzobe Smallholders ezigbo onodu, na ezigbo mmekorita oma n’obodo ndi ahu.

Kwa ubochi a na-agbasa ozi sitere na ulo oru etiti na-ahu maka ibupu ahia, na ikwado ahia (Nigerian Export and Investment Promotion Councils), Redio Mbauwa maka Oruugbo (Farm Redio International), Otu Mbauwa maka Nri na Oruugbo (Food and Agriculture Organization), CTA, UNESCO, LEISA, Ama Azumahia Mba-uwa (International Trade Centre), Ulooru etiti na nke steeti maka azumahia, na nke oruugbo (ministries of commerce and agriculture, national and local), nakwa chambers of commerce. Ego e ji ahazi oru niile ndi a bu ego e wetara na-iresi ndi choronu oge ikwuputa maka ihe ha choro ka oha mara maka ya - ndi mmadu kwuuru onwe

ha, ndi na-ako nnukwu ugbo, ndi na-ere ihe gbasara oruugbo, ndi obere na agbata nnukwu ahia, ndi otu aka-goomenti-adighinaya no n’ime obodo, ndi goomenti, na ndi oha obodo, ndi smallholders na onwe ha. A na-eresikwa ohere maka oha obodo choro imaokwa, ndi choro izi ozi ekele, nkwekorita oru (production agreement), ikwunye ego maka inuchata, ire usoro oru, na imeputa ma rekwaa akwukwo nkowa maka oruugbo, nke e ji usoro nkuzi ozi redio were dee.

MMENWOOtu Nguzobe Ndi-oji-obere na-agbasi mbo ike igosi ndi obodo ozo, na ndi niile o gbasaara ihe ha mutara n’ikwudo otu ahu, ihe nnwale na ihe ndi gara nke oma ha huchara, ya na ufuru o na –enwe na gburugburu ma na mmepe, ma e jikoo aka onu wee ruba ya. Ichigharitoka mmuta na ozi di mkpa agafeela ime steeti Imo, ka e were hu na ime obodo ndi ozo diga na Nigeria ritere uru n’udi oru a baraala oke uru.

Kwa afo, otu a na-ekpokolota ihe dum ha mutara dee ya n’akwukwo, nke na egosi ntonana ebumnuche ha, na mmuo oru na-achi oru ha niile, etu ha si were choputa ufuru oru ha, na ihe okpurukpu siri n’oru ha puta. Ha na-eke galu nnoo otu ndi ozo nwere mmasi n’oru nchekwaba na mmepe ime obodo ihe ndeputa ndia, ya na otu ndi ozo nwere ike irutu ime obodo ndi ozo. Ndi ozo ha na-ezigara akwukwo ndeputa oru a bu goomenti etiti, goomenti steeti, goomenti ochichi ime obodo, ndi niile o gbasara- bu ndi a rioro oru ka ha hu na oru a ruru nkwurita uka n’internet, ogbako nkowa, ogbako oru, na ogbako ntune.

ITIKOAKA N’ORUIhe ga-eme ka oru gaa nke oma, too-ato, gaa n’anya ya, ma burukwa ihe a ga-eme ebe ozo, bu ma enwee ezigbo ntiko aka onu n’etiti ndi niile oru gbasara: ndi so na oha obodo, ndi no n’isi ala na ndi no na mba ofesi. Otu mkpa njikoakaonu a na-egbo bu ime ka ozi di mkpa banyere ihazite oruugbo, ichekwaba gburugburu, mmepe toro-ato,

Page 10: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

“I chekwaba odidi di iche iche n’okike ga-eme ka ndi ogbenye bi n’ime obodo nweta uzo adimndu toro-ato. O dimkpa n’emere Atumatu a ka ihe di ezigbo nkpa na ala anyi bu Nigeria.”

Okwu si n’onu Nnaemeka Ikegwuonu, Onye isi oru, Nguzobe Ndi-oji-obere

1010

na ibanye ahia mgbe kwesiri ekwesi, rue Nguzobe Smallholders aka mgbe ha choro ya, ya na etu o ga-esi baara ndi na-ege ha nti uru. A na-enyocha ozi ndi a, iji hu na ha dika a choro ha, nwee ike ibara ndi ebun’obi wee mepee ya uru. A na-atughari ozi ndi na asusu Igbo, na-agbasa ozi ahu na-erute ndi kariri nari puku mmadu abuo na iri ise kwa ubochi. Ndi a buga ndi na-etiko aka n’oru a:

• Chamber of Commerce and Industry nke Owerri• Chamber of Commerce and Industry nke Onitsha (ya nakwa

chambers of commerce and industry nke Steeti ndia: Lagos Enugu, Kano, na Kaduna)

• The Nigerian Association of Chambers of Commerce, Industry, Mines and Agriculture

• The Trade Desk of Foreign Embassies and Nigerian–Foreign Countries Business Councils

• Ministry of Agriculture and Natural Resources nke Imo Steeti (ya

nakwa Commerce and Industry ya na ha na-aruko oru onu) • Federal Ministry of Commerce and Industry (ya nakwa

Agriculture and Rural Development ya na ha na-aruko oru onu)• The Nigerian Export Promotion Council • Farm Radio International • The Nigerian Investment Promotion Council • International Trade Center - Geneva • Centre for the Promotion of Exports from Developing Countries

- The Netherlands • The Food and Agriculture Organization, Agricultural Marketing

Department and Early Warning Systems• Guardian Newspaper Nigeria (nke nwere ebe o na-ekwu maka

oruugbo kwa izuuka) • Trade Net (nke mba Ghana-maka ire ahia) • Atumatu iji Redio na Internet gbasaa ozi n’ime obodo (RANET) ,

maka I gbaama etu ihu igwe ga-adi

Page 11: NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) · UDUDI OKIKE DI NAYA: Oru ugbo na-edokwa okike 3 NGUZOBE NDI-OJI-OBERE (SMALLHOLDERS) Nigeria IHE DIGA N’IME YA Ntoala ya, na ihe di n’ime

MAKA IGUKWA IHE BANYERE ORU A

• Oba akuko ozi Nguzobe Smallholders (website) http://smallholdersfoundation.org/ • Ikiri akuko e jiri foto koo maka oru Nguzobe Smallholder (PhotoStory) (Youtube) http://www.youtube.com/watch?v=L0Ne2m-V41U

Equator InitiativeEnvironment and Energy GroupUnited Nations Development Programme (UNDP)304 East 45th Street, 6th FloorNew York, NY 10017Tel: +1 646 781-4023 www.equatorinitiative.org

Otu Mbauwa na-ahu maka Oru Mmepe-United Nations Development Programme (UNDP), bu ngalaba Otu Mbauwa (UN) na-ahu maka mmepe nke uwa nile. Ha na-agbakari mbo ihu ihe mgbanwe, na-emekwa ka mmuta, ako si n’oru na ngwaoru rutu onye obula, ka ha were were ya kwaara onwe ha ezigbo onodu.

Atumatu oru Equator na-ejiko otu Mbauwa, ndi ochichi, oha mmadu, ndi na-achu ego, na otu diga n’imeime obodo, ka ha ghota ihe bu mmepe toro-ato, ma mekwee ka udi mmepe a na-agawanye n’ihu n’ime obodo niile n’inyere ndi mmadu, okike, na ndi na- agbasimbo ike aka.

©2012 by Equator Initiative All rights reserved

Tudo ihentudo diga n’okpuru ka I wee guo akuko oru ndi ozo dikwa ka nke a: